Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 14:3-13 Bible Nso (IGBOB)

3. Ndia nile jikọtara onwe-ha n'otù na ndagwurugwu Sidim (nke ahu bu Oké Osimiri Nnú).

4. Arọ iri na abua ka ha fere Kedoalaoma, n'arọ nke-iri-na-atọ ha we nupu isi.

5. N'arọ nke-iri-na-anọ Kedoalaoma we bia, ya na ndi-eze ndi ya na ha yikọrọ, ha tib͕ue Refaim n'Ashterot-Kanaim, na Zuzim nime Ham, na Imim nime Shave-kiriataim,

6. na ndi Hoa n'ugwu-ha, bú Sia, rue El-peran, nke di n'akuku ọzara.

7. Ha we chigharia, bia En-mishpat (nke ahu bu Kedesh), tib͕ue ndi bi n'ọhia nile nke ndi Amalek, tib͕u kwa ndi-Amorait, ndi bi na Hazazon-tema.

8. Eze Sọdọm na eze Gọmọra na eze Adma na eze Zeboyim na eze Bila (nke ahu bu Zoa) we pua, do agha n'usoro imegide ha nime ndagwurugwu Sidim;

9. imegide Kedoalaoma, bú eze Ilam, na Taidal, bú eze Goyim, na Amrafel, bú eze Shaina, na Ariok, bú eze Elasa; eze anọ megide eze ise ahu.

10. Ma ndagwurugwu Sidim bu nání olùlù olùlù nke bitumen; ndi-eze Sọdọm na Gọmọra we b͕alaga, da n'ebe ahu, ndi fọduru we b͕alaga n'ugwu.

11. Ha we chiri àkù nile nke Sọdọm na Gọmọra, na ihe-oriri-ha nile, la.

12. Ha chiri kwa Lot na àkù-ya la, bú nwa nwa-nne Abram, n'ihi na ya onwe-ya bi na Sọdọm.

13. Onye b͕apuru ab͕apu we bia gosi Abram, bú onye-Hibru: ma ya onwe-ya bi n'etiti osisi terebinth nke Mamre, bú onye-Amorait, nwa-nne Eshkol, na nwa-nne Ana; ndi ahu bu kwa ndi ha na Abram di n'ọb͕ub͕a-ndu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 14