Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 14:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'ubọchi nke Amrafel, bú eze Shaina, na nke Ariok, bú eze Elasa, na nke Kedoalaoma, bú eze Ilam, na nke Taidal, bú eze Goyim,

2. na ha buru agha megide Bira, bú eze Sọdọm, megide kwa Biasha, bú eze Gọmọra, na Shainab, bú eze Adma, na Shemiba, bú eze Zeboyim, na eze Bila (nke ahu bu Zoa).

3. Ndia nile jikọtara onwe-ha n'otù na ndagwurugwu Sidim (nke ahu bu Oké Osimiri Nnú).

4. Arọ iri na abua ka ha fere Kedoalaoma, n'arọ nke-iri-na-atọ ha we nupu isi.

5. N'arọ nke-iri-na-anọ Kedoalaoma we bia, ya na ndi-eze ndi ya na ha yikọrọ, ha tib͕ue Refaim n'Ashterot-Kanaim, na Zuzim nime Ham, na Imim nime Shave-kiriataim,

6. na ndi Hoa n'ugwu-ha, bú Sia, rue El-peran, nke di n'akuku ọzara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 14