Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 13:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. O si na Negeb je na nbuli-ije-ya we rue Bet-el, rue ebe ahu ebe ulo-ikwū-ya diri site na nmalite, n'etiti Bet-el na Ai;

4. rue ọnọdu nke ebe-ichu-aja ahu nke ọ mereri n'ebe ahu na mbu: Abram we kpọkue aha Jehova n'ebe ahu.

5. Ọzọ kwa, Lot, onye ya na Abram nāyikọ je, ọ nwere igwè ewu na aturu, na igwè ehi, na ọtutu ulo-ikwū.

6. Ala ahu anagideghi ha, ibikọ n'otù: n'ihi na àkù-ha riri nne, ha apughi kwa ibikọ n'otù.

7. Ise-okwu we di n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo Abram na ndi-ọzùzù anu-ulo Lot: ndi Kenean na ndi-Perizait nēbi kwa n'ala ahu mb͕e ahu.

8. Abram we si Lot, Biko, ka ise-okwu ghara idi n'etiti mu na gi, na n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo nkem na ndi-ọzùzù anu-ulo nke gi; n'ihi na nwa-nne ka ayi bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 13