Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 12:9-19 Bible Nso (IGBOB)

9. Abram we bulie ije, nēje nēbuli kwa ije n'uzọ Negeb.

10. Oké unwu we di n'ala ahu: Abram we ridarue Ijipt inọ n'ebe ahu dika ọbìa; n'ihi na oké unwu ahu di ike n'ala.

11. O rue, mb͕e ọ biaruru nso iba n'Ijipt, na ọ siri Serai, bú nwunye-ya, Biko, le, amaram na nwayi mara nma ile anya ka i bu:

12. O gēru kwa, mb͕e ndi Ijipt gāhu gi, na ha gāsi, Nwunye-ya ka nwayi a bu: ha ewe b͕uem, ma gi ka ha gēdebe ndu.

13. Biko, si na ọ bu nwa-nnem nwayi ka i bu: ka ọ we dirim nma n'ihi gi, ka nkpuru-obim we di kwa ndu n'ihi gi.

14. O rue, mb͕e Abram batara n'Ijipt, na ndi Ijipt huru nwayi ahu na nwayi mara nma nke-uku ka ọ bu.

15. Ndi-isi Fero we hu ya, too ya n'iru Fero: ewe kubata nwayi ahu n'ulo Fero.

16. Ọ we me Abram nke-ọma n'ihi ya: ọ we nwe ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na oke-inyinya-ibu, na ndi-orù ndikom, na ndinyom nēje ozi, na nne-inyinya-ibu, na kamel.

17. Ma Jehova were ihe-ọjọọ uku di iche iche tie Fero na ulo-ya n'ihi okwu bayere Serai, bú nwunye Abram.

18. Fero we kpọ Abram, si, Gini bu nka i meworom? n'ìhi gini ka a nēgosighm na nwunye-gi ka ọ bu?

19. N'ihi gini ka i siri, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? m'we luta ya n'onwem na nwunye: ma ub͕u a, le nwunye-gi, kuru ya, la.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 12