Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 11:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. Ngwa, ka ayi rida, ghagbue asusu-ha n'ebe ahu, ka ha we ghara inurita asusu ibe-ha.

8. Jehova we me ka ha si n'ebe ahu b͕asa n'elu uwa nile: ha we rapu iwu obodo ahu.

9. N'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Bebel; n'ihi na n'ebe ahu ka Jehova ghab͕uru asusu uwa nile: ọ bu kwa n'ebe ahu ka Jehova mere ka ha si b͕asa n'elu uwa nile.

10. Ndia bu usoro-ọmumu Shem. Shem b͕ara ọgu arọ ise, mua Apakshad arọ abua ka iju-miri ahu gasiri:

11. Shem di ndu, mb͕e ọ musiri Apakshad, nnù arọ na ọgu ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 11