21. Reu di ndu, mb͕e ọ musiri Serug, ọgu arọ iri na arọ asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
22. Serug di ndu orú arọ na iri, mua Nehoa:
23. Serug di ndu, mb͕e ọ musiri Nehoa, ọgu arọ iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
24. Nehoa di ndu orú arọ na iteghete, mua Tira:
25. Nehoa di ndu, mb͕e ọ musiri Tira, ọgu arọ ise na iri na iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
26. Tira di ndu ọgu arọ atọ na iri, mua Abram, na Nehoa, na Heran.
27. Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot.
28. Heran we nwua n'iru nna-ya Tira n'ala amuru ya, n'Ua nke ndi Kaldea.
29. Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska.