Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 10:12-26 Bible Nso (IGBOB)

12. na Resen n'etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu).

13. Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim,

14. na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim.

15. Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het;

16. na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait;

17. na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin;

18. na ndi Avad, na ndi Zemar, na ndi Hemat: emesia ab͕uru nile nke ndi Kenean we b͕asa.

19. Ókè-ala nke ndi Kenean we buru site na Zaidon, mb͕e i nēje Gera, rue Geza: mb͕e i nēje Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, rue Lesha.

20. Ndia bu umu-ndikom Ham, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, nime mba nile ha.

21. Shem kwa, amukwara umu nye ya onwe-ya, ọ bu nna umu nile nke Iba, nwa-nne nke-okenye nke Jefet.

22. Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram.

23. Umu-ndikom Eram kwa; Uz, na Hul, na Geta, na Mash.

24. Apakshad muru Shela; Shela muru Iba.

25. Amuru umu-ndikom abua nye Iba: aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan.

26. Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jenesis 10