Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 6:30-34 Bible Nso (IGBOB)

30. Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu oriImeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya:

31. Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa;Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye.

32. Onye nākwa nwayi iko, obi amam-ihe kọrọ ya:Onye nēmebi nkpuru-obi nke aka ya ka onye nēme ya bu.

33. Ọnyá-ntiputa na nlelì ka ọ gāhu;Ita-uta-ya kwa, agaghi-ehichapu ya.

34. N'ihi na ekworo bu ọnuma nke nwoke;Ọ gaghi-enwe ọmiko n'ubọchi ọ́bọ̀.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 6