Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 6:3-21 Bible Nso (IGBOB)

3. Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi,N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi;Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti.

4. Enyela anya-gi abua ura,Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura.

5. Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá,Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà.

6. Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu;Le uzọ-ya nile, we mara ihe:

7. Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi,

8. Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku,Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi.

9. Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu?Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?

10. Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà,Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala;

11. Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe,Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.

12. Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe;O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari;

13. O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu,O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe.

14. Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile:Ọ nēzisa ise-okwu.

15. N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede;N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.

16. Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:

17. Anya di elu, na ire okwu-ugha,Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;

18. Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;

19. Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.

20. Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

21. Hie ha n'obi-gi mb͕e nile,Ke ha n'olu-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 6