Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 6:17-29 Bible Nso (IGBOB)

17. Anya di elu, na ire okwu-ugha,Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;

18. Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;

19. Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.

20. Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

21. Hie ha n'obi-gi mb͕e nile,Ke ha n'olu-gi.

22. Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi;Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi;Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.

23. N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè;Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:

24. Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ,N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi.

25. Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi;Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.

26. N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha:Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.

27. Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya,Ma uwe-ya agaghi-ere ọku?

28. Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku,Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua?

29. Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di;Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 6