15. N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede;N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.
16. Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:
17. Anya di elu, na ire okwu-ugha,Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;
18. Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;
19. Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.
20. Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:
21. Hie ha n'obi-gi mb͕e nile,Ke ha n'olu-gi.
22. Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi;Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi;Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.
23. N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè;Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:
24. Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ,N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi.
25. Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi;Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.
26. N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha:Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.
27. Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya,Ma uwe-ya agaghi-ere ọku?
28. Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku,Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua?
29. Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di;Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
30. Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu oriImeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya:
31. Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa;Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye.
32. Onye nākwa nwayi iko, obi amam-ihe kọrọ ya:Onye nēmebi nkpuru-obi nke aka ya ka onye nēme ya bu.
33. Ọnyá-ntiputa na nlelì ka ọ gāhu;Ita-uta-ya kwa, agaghi-ehichapu ya.