Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 6:12-20 Bible Nso (IGBOB)

12. Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe;O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari;

13. O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu,O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe.

14. Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile:Ọ nēzisa ise-okwu.

15. N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede;N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.

16. Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:

17. Anya di elu, na ire okwu-ugha,Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;

18. Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;

19. Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.

20. Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 6