Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 6:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwam, ọ buru na i nọworo madu-ibe-gi na mbe,Ọ buru na i narawo onye ala ọzọ n'aka ibu onye-mbe,

2. Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n'ọnyà,Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi.

3. Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi,N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi;Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti.

4. Enyela anya-gi abua ura,Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura.

5. Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá,Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà.

6. Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu;Le uzọ-ya nile, we mara ihe:

7. Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 6