1. Umum, nurunu idọ-aka-na-ntí nke nna,Tọ-kwa-nu nti n'ala ima nghọta:
2. N'ihi na ezi ihe-nmuta ka m'nyeworo unu;Unu arapula iwum.
3. N'ihi na nwa ka m'buru nnam,Di nrò, buru kwa nwa enwere nání ya n'iru nnem.
4. O we zím ihe, sim,Ka obi-gi jide okwum nile;Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu:
5. Nweta amam-ihe, nweta nghọta;Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi:
6. Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi;Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi.
7. Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe:E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta.
8. Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi:Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi.
9. Ọ gēnye isi-gi okpu amara:Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n'aka.