Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 27:7-20 Bible Nso (IGBOB)

7. Nkupuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi:Ma ihe nile ọ bula nke nēlu ilu nātọ nkpuru-obi agu nāgu utọ.

8. Dika nnunu nke nēsi n'akwu-ya efefu,Otú a ka madu di nke nēsi n'ọnọdu-ya akpafu.

9. Manu na ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ nēme ka obi ṅuria:Otú a ka utọ eyì madu di nke sitere na ndum-ọdu nke nkpuru-obi.

10. Arapula eyì-gi na eyì nna-gi;Abà-kwa-la n'ulo nwa-nne-gi n'ubọchi nhuju-anya-gi:Ọ di nma, bú ab͕ata-obi nke nọ nso, Kari nwa-nne nke nọ n'ebe di anya.

11. Mara ihe, nwam, we me ka obim ṅuria,Ka m'we zaghachi onye nātam uta okwu.

12. Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.

13. Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;N'ọnọdu nwanyi nābughi nwunye-ya nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.

14. Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n'isi-ututu ime ya,Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya.

15. Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo,Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri:

16. Onye nēzobe ya ezobewo ifufe,Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute.

17. Ígwè nāmucha ígwè;Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.

18. Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya;Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.

19. Dika miri si eme ka iru hu iru,Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.

20. Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì;Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 27