18. Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya;Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.
19. Dika miri si eme ka iru hu iru,Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.
20. Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì;Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu.
21. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo,Anānwa kwa onye ọ bula site n'otuto-ya.
22. Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu,Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya.
23. Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma,Tukwasi obi-gi n'igwè anu-ulo-gi nile: