Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 27:17-26 Bible Nso (IGBOB)

17. Ígwè nāmucha ígwè;Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.

18. Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya;Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.

19. Dika miri si eme ka iru hu iru,Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.

20. Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì;Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu.

21. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo,Anānwa kwa onye ọ bula site n'otuto-ya.

22. Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu,Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya.

23. Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma,Tukwasi obi-gi n'igwè anu-ulo-gi nile:

24. N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di;Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile?

25. Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu,Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile.

26. Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi,Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 27