Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 27:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Anyala isi bayere echi;N'ihi na i maghi ihe chi gābọ.

2. Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi;Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi.

3. Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú;Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua.

4. Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa;Ma ònye gēguzo n'iru ekworo?

5. Ọ di nma, bú iba-nba n'ìhè,Kari ihu-n'anya nke ezobeworo ezobe.

6. Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ob͕ub͕u-mma nile nke onye nāhu gi n'anya bu:Ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 27