22. N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya,Jehova gākwughachi kwa gi.
23. Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo:Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.
24. Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.
25. Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà,Otú a ka okwu ọma anuru site n'ala di anya di.
26. Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibiKa onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu.
27. Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma:Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru.
28. Obodo etikpọrọ etikpọ nke mb͕idi nādighiKa onye ọ bula nke nādighi-ebọchi mọ-ya bu.