Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 24:24-33 Bible Nso (IGBOB)

24. Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu;Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe:

25. Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ,Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi.

26. O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu,Bú onye nāza okwu ziri ezi.

27. Dozie ije-ozi-gi n'èzí,Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n'ọhia;Emesia wu kwa ulo-gi.

28. Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n'efu;Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu?

29. Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya;M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di.

30. N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara,Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ;

31. Ma, le, o púchiri n'ogwu,Akuba kpuchiri iru-ya,Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya.

32. Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya:Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti.

33. Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà,Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 24