Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 23:21-35 Bible Nso (IGBOB)

21. N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile:Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.

22. Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti,Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.

23. Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya;E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.

24. Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku:Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.

25. Ka nna-gi na nne-gi ṅuria,Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.

26. Nwam, nyem obi-gi,Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.

27. N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu;Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu.

28. E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe,Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.

29. Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu?Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu?Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?

30. Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e;Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa.

31. Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara,Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko,Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma:

32. N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta,Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.

33. Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi,Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu.

34. I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri,Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ.

35. Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria;Ha apiawom ihe, amaghm:Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 23