21. N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile:Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.
22. Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti,Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.
23. Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya;E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta.
24. Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku:Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.
25. Ka nna-gi na nne-gi ṅuria,Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.
26. Nwam, nyem obi-gi,Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ.
27. N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu;Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu.
28. E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe,Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari.
29. Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu?Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu?Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara?
30. Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e;Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa.
31. Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara,Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko,Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma:
32. N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta,Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.
33. Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi,Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu.
34. I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri,Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ.
35. Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria;Ha apiawom ihe, amaghm:Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ.