Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 23:15-22 Bible Nso (IGBOB)

15. Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe,Obim gāṅuri, ọbuná nkem:

16. Akurum abua gāwuli kwa n'ọṅù,Mb͕e eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nēkwu ihe ziri ezi.

17. Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo:Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile.

18. N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi;Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.

19. Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe,Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ.

20. Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè;N'etiti ndi nēribiga anu ókè:

21. N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile:Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu.

22. Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti,Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 23