29. Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike:Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.
30. Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di,Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.
31. Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha:Ma Jehova nwe nzọputa.