14. Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe,Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.
15. Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe;Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.
16. Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu,Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.
17. Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu:Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya.
18. Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu;Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.
19. Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara,Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.
20. Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe;Ma madu nzuzu nēloda ya.
21. Onye nāb͕aso ezi omume na ebereNāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.
22. Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo,O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.
23. Onye nēdebe ọnu-ya na ire-yaNēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.
24. Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya,Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.
25. Ọchichọ siri ike nke onye-ume-ngwu nēme ka ọ nwua;N'ihi na aka-ya abua juru ilu ọlu.
26. Ogologo ubọchi nile ka ọ chọsiworo ihe ike nke-uku:Ma onye ezi omume nēnye, ọ dighi-eb͕ochi kwa aka-ya inye ihe.
27. Àjà nke ndi nēmebi iwu bu ihe-árú:O gēsi kwa aṅa ghara ibu ihe-árú kari, mb͕e o ji nzube ọjọ weta ya?
28. Onye-àmà okwu-ugha gāla n'iyì:Ma onye nānu, rue mb͕e ebighi-ebì ka o gēkwu.
29. Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike:Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.
30. Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di,Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.
31. Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha:Ma Jehova nwe nzọputa.