Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 21:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova:N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya.

2. Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua:Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.

3. Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpeBu ihe Jehova nārọputa kari àjà.

4. Anya npako na obi di nganga,Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.

5. Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù:Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.

6. Ikpa àkù site n'ire okwu-ughaBu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.

7. Ipunara-madu-ihe nke ndi nēmebi iwu gēkpochapu ha;N'ihi na ha juru ime ihe ekpere n'ikpe.

8. Ihe b͕agọrọ ab͕agọ nke-uku ka uzọ onye ikpe mab͕uru ya bu:Ma onye di ọcha n'obi, ọlu-ya ziri ezi.

9. Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo,Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.

10. Nkpuru-obi nke onye nēmebi iwu nāchọsi ihe ọjọ ike:Madu-ibe-ya abughi onye imere amara n'anya-ya.

11. Mb͕e anēri onye nākwa emò nra, anēme ka onye nēnweghi uche mara ihe:Ọzọ, mb͕e anēme ka onye nke mara ihe nwe uche, ọ nānara ihe-ọmuma.

12. Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu;Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.

13. Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike,Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 21