Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 18:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.

7. Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi,Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.

8. Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku,Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.

9. Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya,Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.

10. Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu:Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.

11. Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike,Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.

12. N'iru ntipia ka obi madu di elu,Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

13. Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu,Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 18