Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 15:8-25 Bible Nso (IGBOB)

8. Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova:Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.

9. Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu:Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya.

10. Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ:Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.

11. Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova?Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya?

12. Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba:Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru.

13. Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka iru di nma:Ma eji ihe-nwuta nke obi tib͕ue mọ madu.

14. Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma:Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n'uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo.

15. Ubọchi nile nke onye ewedara n'ala jọrọ njọ:Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile.

16. Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova,Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya.

17. Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu,Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya.

18. Onye-ọnuma nākpali ise-okwu:Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.

19. Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu:Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli.

20. Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria:Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.

21. Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù:Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi.

22. Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh:Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.

23. Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya:Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!

24. Uzọ ndu nārigo elu n'ebe onye nwere uche nọ,Ka o we si n'ala-mọ di n'okpuru wezuga onwe-ya.

25. Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu:Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 15