Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 15:25-33 Bible Nso (IGBOB)

25. Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu:Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.

26. Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu:Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha.

27. Onye nēmekpa èzí-na-ulo nke aka ya aru ka onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku bu:Ma onye nākpọ onyinye iri-ngo asì gādi ndu.

28. Obi onye ezi omume nātughari uche n'iza okwu:Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche.

29. Jehova di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ:Ma ekpere ndi ezi omume ka Ọ nānu.

30. Ihe nke nēnye anya ìhè nēme ka obi ṅuria:Ezi ihe anuru anu nēme ka ọkpukpu nile ma abuba.

31. Nti nke nānu iba-nba nke ndu,N'etiti ndi mara ihe ka ọ gānọ ọnọdu-abali.

32. Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya:Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe.

33. Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe;Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 15