Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 15:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu:Ma okwu nwuta nākpali iwe.

2. Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma:Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

3. N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di,Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.

4. Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu:Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu.

5. Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya:Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche.

6. N'ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di:Ma n'ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di.

7. Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma:Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.

8. Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova:Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.

9. Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu:Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya.

10. Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ:Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.

11. Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova?Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 15