16. Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu:Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ.
17. Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ:Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu.
18. Inọ-n'ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti:Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru.
19. Mb͕e ihe anāchọsi ike mere ọ nātọ nkpuru-obi utọ:Ma ọ bu ihe-árú n'anya ndi-nzuzu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha.
20. Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe:Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.
21. Ndi-nmehie ka ihe ọjọ nāchu:Ma ndi ezi omume ka agākwughachi ezi ihe.
22. Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya;Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu.
23. Ọtutu ihe-oriri di n'ubi ndi-ob͕eye:Ma o nwere nke anēkpochapu site n'ikpe nābughi ikpe.
24. Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì:Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike.
25. Onye ezi omume nēri ihe rue mb͕e afọ juru nkpuru-obi-ya:Ma afọ ndi nēmebi iwu, ihe nākọ ya.