Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 13:10-16 Bible Nso (IGBOB)

10. Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa:Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.

11. Àkù nke sitere n'ihe-efu gēbilata:Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba.

12. Nchere anēchere ogologo mb͕e di anya nēme ka obi nāria ọria:Ma osisi nke nēnye ndu ka ihe anāchọsi ike bu, mb͕e ọ biaruworo.

13. Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya:Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ.

14. Iwu onye mara ihe bu isi-iyi nke ndu,Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.

15. Ezi uche nēnye amara:Ma uzọ ndi-nghọb͕u bu nání nkume.

16. Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu:Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 13