Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 13:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya:Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.

2. Site na nkpuru nke ọnu-ya ka onye ọ bula gēri ezi ihe:Ma nkpuru-obi ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēri ime-ihe-ike.

3. Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya:Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya.

4. Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu:Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.

5. Okwu-ugha ka onye ezi omume nākpọ asì:Ma onye nēmebi iwu nēsì ísì, we nwe iru-ihere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 13