Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 11:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Ihe-osìsì aghughọ bu ihe-árú n'anya Jehova:Ma nkume-isì-ihe zuru ezu bu ihe nātọ Ya utọ.

2. Nganga bia, nlelì abia kwa:Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di.

3. Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha:Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha.

4. Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe:Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.

5. Ezi omume nke onye zuru okè gēme ka uzọ-ya zie ezi:Ma nmebi-iwu nke aka ya ka onye nēmebi iwu gēji da.

6. Ezi omume nke ndi ziri ezi gānaputa ha:Ma n'ọchichọ nke ha nāchọsi ike ka agānwude ndi nāghọb͕u aghọb͕u.

7. Mb͕e madu nke nēmebi iwu nwuru, olile-anya-ya gāla n'iyì:Ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n'iyì.

8. Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu,Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya.

9. Ọnu-ya ka onye emeruru emeru ji ebibi madu-ibe-ya:Ma ihe-ọmuma ka agēji dọputa ndi ezi omume.

10. N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ:Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di.

11. Eji ngọzi nke ndi ziri ezi bulie obodo:Ma eji ọnu ndi nēmebi iwu akwada ya.

12. Onye nēleda madu-ibe-ya anya, obi amam-ihe kọrọ ya:Ma onye-nghọta nāb͕a nkiti.

13. Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo:Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu.

14. Mb͕e ọ nādighi ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda:Ma nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 11