Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 10:9-15 Bible Nso (IGBOB)

9. Onye nēje ije n'izu-okè nēje na ntukwasi-obi:Ma onye nēme ka uzọ-ya nile b͕agọ ab͕agọ, agāmara ya.

10. Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

11. Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu:Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

12. Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche:Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.

13. N'eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe:Ma nkpa-n'aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ.

14. Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma:Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso.

15. Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike:Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 10