7. Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi:Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure.
8. Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.
9. Onye nēje ije n'izu-okè nēje na ntukwasi-obi:Ma onye nēme ka uzọ-ya nile b͕agọ ab͕agọ, agāmara ya.
10. Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.
11. Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu:Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.
12. Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche:Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.
13. N'eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe:Ma nkpa-n'aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ.
14. Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma:Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso.