Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 10:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Ngọzi nile nādiri isi onye ezi omume:Ma ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

7. Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi:Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure.

8. Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

9. Onye nēje ije n'izu-okè nēje na ntukwasi-obi:Ma onye nēme ka uzọ-ya nile b͕agọ ab͕agọ, agāmara ya.

10. Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

11. Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu:Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 10