Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 10:3-5 Bible Nso (IGBOB)

3. Jehova agaghi-ekwe ka agu gub͕ue nkpuru-obi onye ezi omume:Ma ọchichọ nke ndi nēmebi iwu nāchọsi ike ka Ọ nākwapu.

4. Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu:Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.

5. Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche:Ma onye nāraru ura n'owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 10