Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 10:20-32 Bible Nso (IGBOB)

20. Ọla-ọcha arọputara arọputa ka ire onye ezi omume bu:Obi ndi nēmebi iwu di ka ihe ntà.

21. Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu:Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.

22. Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya,Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.

23. Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ:Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta.

24. Ihe onye nēmebi iwu nātu ujọ ya, nke ahu gābiakute ya:Ma ihe ndi ezi omume nāchọsi ike ka agēnye ha.

25. Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa:Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi.

26. Dika manya b͕ara uka si adi n'ebe ezé di, na dika anwuru-ọku si adi n'ebe anya di,Otú a ka onye-ume-ngwu nādi n'ebe ndi nēzì ya ozi nọ.

27. Egwu Jehova nātukwasi ubọchi na ndu madu:Ma arọ nile nke ndi nēmebi iwu gādi nkpunkpu.

28. Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù:Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.

29. Ebe siri ike n'ebe onye zuru okè nọ ka uzọ Jehova bu;Ma ọ bu nbibi n'ebe ndi nālu ajọ ihe nọ.

30. Agaghi-ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi:Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n'uwa.

31. Ọnu onye ezi omume nāmi amam-ihe dika nkpuru:Ma ire nke nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, agēbipu ya.

32. Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume mara ihe nātọ utọ:Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 10