16. Ọlu onye ezi omume nēdubà na ndu;Ihe-omume nke onye nēmebi iwu nēdubà na nmehie.
17. Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu:Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.
18. Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha;Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu.