Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 10:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

11. Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu:Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

12. Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche:Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.

13. N'eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe:Ma nkpa-n'aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ.

14. Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma:Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso.

15. Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike:Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu.

16. Ọlu onye ezi omume nēdubà na ndu;Ihe-omume nke onye nēmebi iwu nēdubà na nmehie.

17. Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu:Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.

18. Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha;Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ilu 10