Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 9:8-17 Bible Nso (IGBOB)

8. Onye-nche ka Efraim bu n'aka Chinekem: ma onye-amuma, ib͕udu nke osi-ọnyà di n'uzọ-ya nile, ikpọ-asì di kwa n'ulo Chineke-ya.

9. Ha abamiwo n'ibibi onwe-ha, dika n'ubọchi nke Gibea: Ọ gēcheta ajọ omume-ha, leta nmehie nile ha.

10. Dika nkpuru-vine n'ọzara ka M'chọtara Israel; dika nkpuru nke buru uzọ cha n'osisi fig n'oge mbu ya ka M'huru nna-unu-hà: ma ha onwe-ha biakutere Beal-peoa, kewaputa onwe-ha nye ihere ahu, ghọ ihe-árú dika ihe ahu ha huru n'anya.

11. Efraim, dika anu-ufe ka nsọpuru-ha gēfepu: ọmumu-nwa na idi-ime na itu-ime ewe ghara idi.

12. E, ọ buru na ha azulite umu-ha, ma M'gāb͕aba ha aka nwa, madu ọ bula ewe ghara idi: e, ahuhu di-kwa-ra ha mb͕e M'gēsi n'aru ha wezuga Onwem!

13. Efraim, dika M'leworo Taia anya, bú ihe akuworo n'ebe mara nma: ma Efraim aghaghi ichiputara ob͕u-madu umu-ya.

14. Nye ha, Jehova: gini ka I gēnye? nye ha afọ nēmebi ime na ara kpọrọ nku.

15. Ihe ọjọ nile ha di nime Gilgal: n'ihi na n'ebe ahu ka M'kpọrọ ha asì: n'ihi ihe ọjọ nke omume nile ha ka M'gāchupu ha n'ulom: M'gaghi-ahu kwa ha n'anya ọzọ; ndi-isi-ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha.

16. Etib͕uwo Efraim, nkpọrọgwu-ha akpọnwuwo, ha agaghi-ami nkpuru: e, asi na ha amua nwa, ma M'gēme ka umu afọ-ha anāchọsi ike nwua.

17. Chinekem gāju ha, n'ihi na ha egeghi Ya nti: ha gābu kwa ndi nāwaghari n'etiti mba nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hosea 9