Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 2:13-23 Bible Nso (IGBOB)

13. M'gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n'anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

14. N'ihi nka, le, Mu onwem gaje iràra ya, me ka ọ je n'ọzara, M'gāgwa kwa ya okwu nke gābà ya n'obi.

15. M'gēsi kwa n'ebe ahu nye ya ubi-vine-ya nile, na ndagwurugwu Ekoa ibu ọnu-uzọ olile-anya: ọ gāza kwa n'ebe ahu, dika n'ubọchi nile ọ di na nwata, na dika n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.

16. Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na i gākpọm Chi; i gaghi-akpọkwam Beal ọzọ.

17. M'gēwezuga kwa aha nile nke Bealim n'ọnu-ya, agaghi-ehota kwa ha n'aha-ha ọzọ.

18. N'ubọchi ahu Mu na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe na ihe nākpu akpu nke ala gāb͕ara ha ndu: ọ bu kwa uta na mma-agha na agha ka M'gāb͕ajipu n'ala-ha, me ka ha dina ala na ntukwasi-obi.

19. M'gēkwere kwa ilu gi n'Onwem rue mb͕e ebighi-ebi; e, M'gēkwere ilu gi n'Onwem n'ezi omume, na n'ikpé, na n'ebere, na n'obi-ebere nile.

20. M'gēkwere kwa ilu gi n'Onwem n'ikwesi-ntukwasi-obi: i we mara, Jehova.

21. O gēru kwa n'ubọchi ahu na M'gāza, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gāza elu-igwe, ha onwe-ha gāza kwa ala;

22. ala gāza kwa ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya; ha onwe-ha gāza kwa Jezreel.

23. M'gāgha-kwa-ra ya Onwem n'ala-ya dika nkpuru ọghigha; M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru Lo-ruhama; M'gāsi kwa Lo-ami, Ndim ka i bu; ndi ahu gāsi kwa, Chinekem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hosea 2