1. Israel, laghachikute Jehova, bú Chineke-gi; n'ihi na i suwo ngọngọ site n'ajọ omume-gi.
2. Chirinu okwu n'aka-unu laghachikute Jehova: sinu Ya, Bupu ajọ omume nile ayi, nara ezi ihe: ayi ewe kwughachi eb͕ub͕ere-ọnu-ayi, dika oke-ehi.
3. Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.
4. M'gāgwọ ndaghachi-azu-ha, M'gāhu ha n'anya n'afọ-ofufo: n'ihi na iwem esiwo n'aru ya chigharia.