Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 13:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. Ọ bu nbibi-gi, Israel, na i nēmegidem, nēmegide iye-aka-gi.

10. Òle ebe eze-gi nọ ub͕u a, ka o we zọputa gi n'obodo-gi nile? òle ebe ndi-ikpe-gi nọ, ndi i kwuru okwu bayere ha, si, Nyem eze na ndi-isi?

11. Enyem i eze n'iwem, anapukwam ya nime nrubiga-ókè nke iwem.

12. Ihe ekechiri ekechi ka ajọ omume Efraim bu; ihe ezobere ezobe ka nmehie-ya bu.

13. Ihe-nb͕u nile nke nwanyi ime nēme gābiakute ya: ya onwe-ya bu nwa nāmaghi ihe; mb͕e oge eruwo ọ dighi-eguzo n'ebe ib͕ọwaputa umu.

14. N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.

15. Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.

16. Sameria gāhu ahuhu ikpe-ọmuma-ya; n'ihi na ọ nupuwo isi n'okpuru Chineke-ya: site na mma-agha ka ha gāda; agātupia umu-ntakiri-ha, agāb͕awa kwa ndinyom-ha di ime afọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hosea 13