Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 13:6-14 Bible Nso (IGBOB)

6. Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.

7. M'we diri ha ka ọdum: dika agu, ọ bu n'uzọ ka M'gēche anwu:

8. M'gādakwasi ha dika anu-ọhia bear nke b͕ara aka nwa, M'gādọwa anu-aru b͕ochiri obi-ha: M'gēri ha n'ebe ahu dika ọdum; anu ọhia gādọka ha.

9. Ọ bu nbibi-gi, Israel, na i nēmegidem, nēmegide iye-aka-gi.

10. Òle ebe eze-gi nọ ub͕u a, ka o we zọputa gi n'obodo-gi nile? òle ebe ndi-ikpe-gi nọ, ndi i kwuru okwu bayere ha, si, Nyem eze na ndi-isi?

11. Enyem i eze n'iwem, anapukwam ya nime nrubiga-ókè nke iwem.

12. Ihe ekechiri ekechi ka ajọ omume Efraim bu; ihe ezobere ezobe ka nmehie-ya bu.

13. Ihe-nb͕u nile nke nwanyi ime nēme gābiakute ya: ya onwe-ya bu nwa nāmaghi ihe; mb͕e oge eruwo ọ dighi-eguzo n'ebe ib͕ọwaputa umu.

14. N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hosea 13