Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 13:14-16 Bible Nso (IGBOB)

14. N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.

15. Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.

16. Sameria gāhu ahuhu ikpe-ọmuma-ya; n'ihi na ọ nupuwo isi n'okpuru Chineke-ya: site na mma-agha ka ha gāda; agātupia umu-ntakiri-ha, agāb͕awa kwa ndinyom-ha di ime afọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hosea 13