Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 13:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e Efraim jiri ima-jijiji kwu okwu, ya onwe-ya buliri onwe-ya elu n'Israel: ma ikpe mara ya nime Beal, o we nwua.

2. Ma ub͕u a ha nēmehie kari, we mere onwe-ha arusi apiri api site n'ọla-ọcha-ha, bú arusi di iche iche dika nghọta-ha si di, ọlu nke ndi-ọ̀kà ka ha nile bu: ọ bu bayere ihe ndia ka ha onwe-ha nēkwu okwu, si, Ka ndi nāchu àjà madu sutue umu-ehi ọnu.

3. N'ihi nka ka ha gādi ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu, dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēfechapu n'ebe-nzọcha-ọka, na dika anwuru-ọku si apu na window.

4. Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; ọ dighi kwa chi, ma-ọbughi náním, i gāmara, onye-nzọputa adighi kwa, ma-ọbughi náním.

5. Mu onwem mara gi n'ọzara, n'ala kpọrọ oké nku.

6. Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.

7. M'we diri ha ka ọdum: dika agu, ọ bu n'uzọ ka M'gēche anwu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hosea 13