Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 12:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. o we jisie ike n'aru Mọ-ozi, we nwe ike kari: ọ kwara ákwá, riọ Ya aririọ: nime Bet-el ka Ọ chọtara ya, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ kpayere ayi uka;

5. ọbuná Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha; Jehova bu aha-ncheta-Ya.

6. Ma gi onwe-gi, nime Chineke-gi ka i gālata: debe ebere na ikpé ziri ezi, le kwa anya Chineke-gi mb͕e dum.

7. Kenean! n'aka-ya ka ihe-ọtùtù aghughọ di: ọ huru imeb͕u emeb͕u n'anya.

8. Efraim we si, N'ezie aghọwom ọgaranya, achọtaworom onwem àkù: ihe nile m'nādọb͕u onwem n'ọlu inweta agaghi-achọtaram ajọ omume nke bu nmehie.

9. Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; M'gēme kwa ka i biri n'ulo-ikwū ọzọ, dika n'ubọchi nile nke mb͕e akara àkà.

10. Agwawokwam ndi-amumam okwu, ọ bu kwa Mu onwem mere ka ọhù ba uba; ọ bu kwa site n'aka ndi-amuma ka M'ji ihe ama àtù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hosea 12