Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 11:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e Israel bu nwata, ahurum ya n'anya, ọ bu kwa site n'Ijipt ka M'kpọputara nwam.

2. Dika ha kpọrọ ha òkù, otú a ka ha puru n'iru ha nēje: Bealim ka ha churu àjà, surere arusi di iche iche apiri api ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

3. Ma Mu onwem nēzí Efraim ije ije; O kuru ha n'ogwe-aka-Ya abua; ma ha amataghi na emerem ka aru di ha nma.

4. Achirim udọ̀ madu, bú ihe-nhiegide ihu-n'anya, adọ ha; M'we diri ha dika ndi nēbuli yoke n'elu ab͕a-ha, anameseti kwa akam me ka ha rie ihe.

5. Ọ gaghi-alaghachi n'ala Ijipt; ma onye Asiria ahu gābu eze-ya n'ihi na ha juru ilaghachi.

6. Mma-agha gēfeghari kwa n'obodo-ya nile, me ka ihe-ntuchi-ya nile gwusia, ripia ha, site na ndum-ọdu nile ha.

7. N'ihi na ndim nākwughari efekefe n'obi idaghachi azu site n'ebe M'nọ: ọ bu ezie na Onye nke nọ n'elu ka ha nākpọ ha ibiakute, ma ọ dighi otù onye efu gēbuli onwe-ya elu.

8. M'gēsi aṅa rara gi nye, Efraim? M'gēsi aṅa nyebiga gi, Israel? M'gēsi aṅa me gi ka i di ka Adma? M'gēsi aṅa do gi ka Zeboim? obim ab͕aghariwo n'arum, obi-eberem nile di ọku n'otù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hosea 11