Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Hosea 11:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e Israel bu nwata, ahurum ya n'anya, ọ bu kwa site n'Ijipt ka M'kpọputara nwam.

2. Dika ha kpọrọ ha òkù, otú a ka ha puru n'iru ha nēje: Bealim ka ha churu àjà, surere arusi di iche iche apiri api ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

3. Ma Mu onwem nēzí Efraim ije ije; O kuru ha n'ogwe-aka-Ya abua; ma ha amataghi na emerem ka aru di ha nma.

4. Achirim udọ̀ madu, bú ihe-nhiegide ihu-n'anya, adọ ha; M'we diri ha dika ndi nēbuli yoke n'elu ab͕a-ha, anameseti kwa akam me ka ha rie ihe.

5. Ọ gaghi-alaghachi n'ala Ijipt; ma onye Asiria ahu gābu eze-ya n'ihi na ha juru ilaghachi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Hosea 11